Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 14:22 - Bible Nso

22 Okwukwe ahu nke gi onwe-gi nwere, nwe ya n'onwe-gi n'iru Chineke. Ngọzi diri onye nēkpeghi onwe-ya ikpé n'ihe ọ nānwaputa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ya mere, ka okwukwe i nwere banyere ihe ndị a bụrụ nke dị nʼetiti gị na Chineke. Ngọzị na-adịrị onye ọbụla nke na-adịghị ama onwe ya ikpe site nʼihe ọ nabatara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 14:22
13 Iomraidhean Croise  

Nime nka ka m'nārughari kwa arum uka inwe akọ-na-uche nādighi-asu ngọngọ n'ebe Chineke na madu nọ mb͕e ọ bula.


Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú.


Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi.


Ma onye nwere obi abua, amawo ya ikpé ma o rie, n'ihi na o siteghi n'okwukwe rie; ma ihe ọ bula nke nēsiteghi n'okwukwe bu nmehie.


Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya.


N'ihi ya i nweghi ngọpu, gi madu, onye ọ bula nēkpe ikpé: n'ihi na i nāma onwe-gi ikpe n'ihe i nēkpe madu-ibe-gi; n'ihi na gi onye nēkpe ikpe nēme otù ihe ahu.


N'ihi na ihe m'nāluta ka m'nāmagh: n'ihi na ihe m'nāchọ, ọ bughi ihe ahu ka m'nēme; kama ihe m'nākpọ asì, ihe ahu ka m'nēme.


Madu nke hujuru anya ka mu onwem bu! ònye gādọputam n'aru nke ọnwu a?


Otú ọ di ọ bughi nime madu nile ka ọmuma-ihe ahu di: kama ufọdu, ebe arusi bu ihe anēme n'ala-ha rue ub͕u a, ha nēri ihe ahu dika ihe achuru n'àjà nye arusi; anēmeru kwa akọ-na-uche-ha, ebe ọ nādighi ike.


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.


Ònye bu onye-amam-ihe nke nāghọta kwa ihe n'etiti unu? ya site n'ibi-obi ọma ya gosi ọlu-ya nile nime idi-nwayọ nke amam-ihe.


Ndi m'huru n'anya, ọ buru na obi-ayi amaghi ayi ikpé, ayi nwere nkwuwa-okwu n'ebe Chineke nọ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan