Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 14:19 - Bible Nso

19 Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ka ihe na-agụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe ga-eweta udo, ya na ime ihe nʼụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 14:19
28 Iomraidhean Croise  

Le, ka o si di nma, ka o si di kwa utọ nke-uku, Bú nbikọ nke umu-nne, ọbuná ibikọ n'otù!


Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.


Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke.


Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.


Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n'udo.


Onye ọ bula n'etiti ayi, ya me ihe gātọ onye-ab͕ata-obi-ya utọ iwetara ya ezi ihe, ka ọ we wulie ya elu dika ulo.


Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile bara urù. Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nēwuli madu elu dika ulo.


dika mu onwem nēme kwa ihe nātọ madu nile n'ihe nile, nāchọghi urù nke akam, kama urù nke madu nile, ka ewe zọputa ha.


Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n'otù ebe, unu nile n'otù n'otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo.


Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi.


Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo.


Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.


Ma ọ buru na onye ahu nke nēkweghi ekwe ekewapu onwe-ya, ya kewapu onwe-ya: emeghi ka nwa-nna-ayi nwoke ma-ọbu nwa-nna-ayi nwanyi buru orù n'okwu di otú a: ma Chineke akpọwo ayi n'udo.


Ma okwu bayere ihe achuru n'àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n'anya nēwuli elu dika ulo.


Unu nēchè oge nile a na ayi nāgọpu onwe-ayi nye unu. Ọ bu n'iru Chineke nime Kraist ka ayi nēkwu. Ma ihe nile bu n'ihi iwuli unu elu dika ulo, ndi m'huru n'anya.


Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu.


ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo:


Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara.


ka ha ghara kwa iṅa nti akukọ-ifò di iche iche na akukọ osuso-ọmumu di iche iche nādighi-agwu agwu, nke bu ihe nākpata ajuju, kari ikpata ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke nke di nime okwukwe: otú a ka m'nēme ub͕u a.


Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha.


Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya:


Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe; Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan