Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 14:14 - Bible Nso

14 Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Dịka onye nọ nʼime Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya nke ọma na o nweghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha na nke onwe ya. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-ahụta ihe ọbụla dịka ihe na-adịghị ọcha, nye onye dị otu a, ihe ahụ adịghị ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 14:14
12 Iomraidhean Croise  

ndi hu-kwa-ra na ufọdu nime ndi nēso uzo-Ya nēri nri-ha n'aka ruru árú, nke ahu bu, aka anākwọghi akwọ.


o we si ha, Unu onwe-unu mara otú ọ bu ihe nēzighi ezi n'iwu ka nwoke nke bu onye-Ju were onwe-ya rapara n'aru onye mba ọzọ ma-ọbu ijekuru ya; otú ọ di, mu onwem ka Chineke gosiri ka m'ghara ikpọ madu ọ bula ihe ruru árú ma-ọbu ihe nādighi ọcha:


Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi.


Akwatula ọlu Chineke n'ihi ihe-oriri. Ihe nile di ọcha n'ezie; ma ihe ọ bula buru madu ahu ihe ọjọ, onye were ihe-isu-ngọngọ nēri ya.


Ma onye nwere obi abua, amawo ya ikpé ma o rie, n'ihi na o siteghi n'okwukwe rie; ma ihe ọ bula nke nēsiteghi n'okwukwe bu nmehie.


Ihe nile ọ bula anēre n'ahia anu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche;


N'ihi na asi na onye ọ bula ahú gi, bú onye nwere ihe-ọmuma, ka i nānọdu na nri nime ulo arusi, akọ-na-uche-ya, ma ọ buru na ọ dighi ike, àgaghi-ewuli ya elu dika ulo iri ihe achuru n'àjà nye arusi?


Otú ọ di ọ bughi nime madu nile ka ọmuma-ihe ahu di: kama ufọdu, ebe arusi bu ihe anēme n'ala-ha rue ub͕u a, ha nēri ihe ahu dika ihe achuru n'àjà nye arusi; anēmeru kwa akọ-na-uche-ha, ebe ọ nādighi ike.


N'ihi na ihe nile ọ bula Chineke kère di nna, ọ dighi kwa ihe ọ bula agāju, ma ọ buru na ewere ekele nara ya:


Ihe nile di ọcha n'ebe ndi di ọcha nọ: ma n'ebe ndi emeruworo ndi nēkweghi kwa ekwe nọ ọ dighi ihe ọ bula di ọcha; kama, emeruwo ma uche-ha ma akọ-na-uche-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan