Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 14:1 - Bible Nso

1 Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 14:1
31 Iomraidhean Croise  

Le, i dọwo ọtutu madu, aka na nti, I nēme kwa ka aka nke nādighi ike di ike.


Dika onye-ọzùzù-aturu ka Ọ gāzù ìgwè aturu-Ya, n'ogwe-aka-Ya ka Ọ gāchikọta umu-aturu, ọ bu kwa n'obi-Ya ka O gēkuru ha, Ọ gēwere nwayọ nēdu ndi nēnye umu ara.


Ọ gaghi-akpaji amì apiara apia, ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nēnwu inyoghi-inyogh: n'ezi-okwu ka ọ gēme ka ikpé puta.


Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi.


Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n'ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha.


N'ihi na, le, Mu onwem gaje ime ka otù onye-ọzùzù-aturu bilie n'ala nka, ọ gaghi-elekọta ndi ebipuru ebipu, ọ gaghi-achọ nke achusara achusa, ọ gaghi-agwọ nke ab͕ajiri ukwu na aka; ọ gaghi-azù nke nēguzo eguzo, ma anu nke aturu mara abuba ka ọ gēri, ukwu nile ha ka ọ gānyajisi.


Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia, Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku, Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri.


Ngwa ngwa Jisus setiri aka-Ya, jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n'ìhi gini ka i ji nwe obi abua?


Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.


n'ihi na ọ bàghi n'obi-ya, kama n'afọ-ya, o we pua n'ulo-ǹsí? O kwuru nka, ka O me ka ihe-oriri nile di ọcha.


Ọ gakara ya-ri mma ma akwuba ya nkume-igwe-nri n'olu, tubà kwa ya n'oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n'ọnyà.


N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānara onye ọ bula M'gēzite, Mu ka ọ nānara; onye nānaram nānara kwa Onye ziterem.


Ndi bi n'ebe ahu, bú ndi nāsu asusu ọzọ, we were obi-ọma mezie ayi n'uzọ anāhughi mb͕e ọ bula: n'ihi na ha funwuru ọku, kpọbata ayi nile, n'ihi miri nke nēzo n'oge ahu, na n'ihi oyi.


N'ihi na asi na nchupu-ha bu ime ka uwa na Chineke di n'otù, gini ka nkpọbata-ha gābu, ma-ọbughi ndu sitere na ndi nwuru anwu?


Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi.


Ọ di nma ka i ghara iri anu, ma-ọbu iṅu manya-vine, ma-ọbu ime ihe ọ bula nke nwa-nna-gi gāsu ngọngọ nime ya.


Ka onye nēri ihe ghara ikpọ onye nādighi-eri ihe-efu; ka onye nādighi-eri ghara kwa ikpe onye nēri ikpé: n'ihi na Chineke kpọbatara ya.


Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ.


N'ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto.


O we tugharia uche n'aru nke onwe-ya nke nwuwori, (ebe ọ b͕ara ihe di ka ọgu arọ ise), tughari kwa uche n'àkpà-nwa Sera na ọ bu ihe nwuru anwu, ma emeghi ya ka ọ ghara idi ike n'okwukwe-ya:


N'ebe ndi nādighi ike nọ m'ghọrọ onye nādighi ike, ka m'we rita ndi nādighi ike n'urù: aghọwom ihe nile n'ebe madu nile nọ, ka m'we si n'uzọ ọ bula zọputa ufọdu.


Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a:


Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ.


Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n'ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.


Ọ buru na onye ọ bula abiakute unu, ma ọ wetaghi ozizí a, unu akpọbatala ya n'ulo, unu asi-kwa-la ya biri nke-ọma:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan