Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 13:7 - Bible Nso

7 Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n'ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú; tunu ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 13:7
23 Iomraidhean Croise  

Otù nwayi we si, Biko, onye-nwem, Mu onwem na nwayi a nēbi n'otù ulo; m'we mua nwa mb͕e mu na ya nọ n'ulo.


Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


Nwam, tua egwu Jehova na eze: Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:


Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri, Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.


Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.


Ọ si, E. Mb͕e ọ batara n'ulo, Jisus we buru uzọ gwa ya okwu, si, Gini bu uche-gi, Saimon? ndi-eze uwa, sìte n'aka ole ndi ka ha nānara ùtú-ahia ma-ọbu ùtú n'isi madu? n'àka umu-ha, ma-ọbu n'aka ndi-ọbìa?


Ha si Ya, Sisa nwe. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.


Jisus we si ha, Nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke. O we ju ha nile anya nke-uku bayere Ya.


Ò ziri ezi n'iwu ka ayi tu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?


O we si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.


Ha we malite ibo Ya ebubo, si, Ayi huru Onye a, ka O nēduhie mba-ayi, nēb͕ochi ha itu ùtú nye Sisa, nāsi kwa na Ya onwe-ya bu Kraist, buru kwa Eze.


N'akuku ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ, ka ihe madu-ibe-unu nātọrita unu utọ nke-uku; n'akuku nsọpuru-unu, nācharanu ibe-unu uzọ;


N'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu nātu kwa ùtú; n'ihi na ha bu ndi nēfè Chineke òfùfè, nānọgidesi ike n'ọlu-ha ime otù ihe a.


Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.


Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist;


Ma tukwasi ihe ndia ha nāmuta kwa ibu ndi nādighi-alu ọlu, nēje n'ulo di iche iche; ma ọ bughi nání na ha bu ndi nādighi-alu ọlu, kama ha bu kwa ndi nēkwu okwu nzuzu, buru kwa ndi nētiye aka n'ọlu nābughi nke aka ha, nēkwu okwu nēkwesighi ka ha kwu.


Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime okwu Chineke na ozizí.


Ka ha ra, bú ndi-orù nke nọ n'okpuru yoke, ha gua ndi-nwe-ha na ndi kwesiri nsọpuru nile, ka ewe ghara ikwulu aha Chineke na ozizí-ayi.


Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.


Samuel we kpọkue Jehova; Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo ubọchi ahu: ndi Israel nile we tua egwu Jehova na Samuel nke-uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan