Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 13:13 - Bible Nso

13 Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n'ehihie; ọ bughi n'ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n'ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n'esem-okwu na ekworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 13:13
42 Iomraidhean Croise  

Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè; N'etiti ndi nēribiga anu ókè:


Ha abua bu ndi ezi omume n'iru Chineke, nāga n'ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n'iwu na n'ihe nile Ọ guru n'ihe ziri ezi nādighi ita uta.


Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi:


Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà;


N'ihi na manya abàghi ndia n'anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n'ututu;


n'ihi na unu bu ndi anu-aru nāchi rue ub͕u a: n'ihi na ebe ekworo na esem-okwu di n'etiti unu, ùnu abughi ndi anu-aru nāchi, ndi nējeghari kwa dika madu?


Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,


ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.


Ya mere mu onwem, bú onye-nkpọrọ nime Onye-nwe-ayi, nāriọ unu ka unu jegharia dika o kwesiri ọkpukpọ nke akpọrọ unu,


Ya mere nka ka m'nēkwu, kwusi kwa ike nime Onye-nwe-ayi, ka unu ghara ijeghari ọzọ dika ndi mba ọzọ nējeghari kwa, n'ihe-efu nke uche-ha,


Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;


Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;


n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè


Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;


unu emela ihe ọ bula n'uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n'uzọ ichọ otuto efu, kama n'obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma;


ka unu jegharia n'uzọ kwesiri Onye-nwe-ayi ime otú ọ gātọ Ya utọ n'uzọ nile, nāmi nkpuru n'ezi ọlu nile ọ bula, nāba kwa uba nime nmazu nke Chineke;


Ya mere, menu ka ihe nile di unu n'aru nke di n'elu uwa nwua; ikwa-iko, adighi-ọcha, ọchichọ ọjọ, agu ihe ọjọ, na anya-uku ahu, n'ihi na nka bu ikpere arusi;


ka unu we nējeghari dika ọ kwesiri Chineke, Onye nākpọbata unu n'ala-eze na ebube nke aka Ya.


ka unu we nējeghari dika o kwesiri unu n'ebe ha nọ, bú ndi nọ n'èzí, ka ihe ọ bula ghara kwa ikpa unu.


nēkpenu ekpere nēwepughi aka;


Ma-ọbu ùnu nēchè na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu okwu n'efu? Àgu ayi nāgusi Mọ ahu ike n'uzọ ekworo, bú Mọ Nke O mere ka O biri nime ayi?


onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri.


Anamaṅuri ọṅu nke-uku na ahuwom ufọdu n'etiti umu-gi ka ha nējeghari nime ezi-okwu, dika ayi natara ihe enyere n'iwu n'aka Nna-ayi.


nāzọputa-kwa-nu ufọdu, nāguputa ha n'ọku; ma werenu egwu mere ufọdu ebere; nākpọ ọbuná uwe anu-aru nyeworo ntupọ asì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan