Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 13:11 - Bible Nso

11 Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya abịala nso. Ya mere, sitenụ nʼụra bilie, nʼihi na nzọpụta anyị adịla nso ugbu a karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 13:11
25 Iomraidhean Croise  

Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


Onye-isi nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ we biakute ya nso, si ya, Gini nēme gi, gi onye oké ura? bilie, kpọkue Chineke-gi, eleghi anya Chineke gēcheta ayi, ayi we ghara ila n'iyì.


N'ututu unu nāsi kwa, Iru elu-igwe gājọ njọ ta: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie, b͕aru kwa. Unu mara itule iru elu-igwe, ma unu apughi itule ihe-iriba-ama nke oge ndia.


Ma mb͕e ihe ndia malitere ime, lenu anya n'elu, welikwanu isi-unu; n'ihi na nb͕aputa-unu nēru nso.


Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo.


Sinu n'ura manya teta n'uzọ ezi omume, unu emehie-kwa-la; n'ihi na ufọdu nēnwe amaghi-ihe bayere Chineke: anamekwu nka ka m'me unu ihere n'iru.


N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.


Unu onwe-unu, nātachi-kwa-nu ogologo-ntachi-obi; menu ka obi-unu guzosie ike: n'ihi na ọbibia nke Onye-nwe-ayi di nso.


Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:


Ebe anēme ka ihe ndia nile la n'iyì otú a, ọ̀ bu aha madu gini ka unu nāghaghi ibu n'ibi-obi nsọ nile na nsọpuru-Chineke nile,


Onye-nwe-ayi anọghi ọdù n'ime nkwa-Ya, dika ufọdu nāgu ya na ọ bu inọ-ọdù; kama Ọ nātachiri unu ogologo-ntachi-obi, n'ihi na O zubeghi ka ndi ọ bula la n'iyì, kama ka madu nile bia rue nchèghari.


Umu-ntakirim, ọ bu oge hour ikpe-azu: dika unu nukwara na otù onye nke nēmegide Kraist nābia, ọbuná ub͕u a ọtutu ndi nēmegide Kraist aputawo; nke ayi sitere na ya mara na ọ bu oge hour ikpe-azu.


Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n'ihi na oge ahu di nso.


O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n'ihi na oge ahu di nso.


Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di.


Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan