Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 13:1 - Bible Nso

1 Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ka onye ọbụla doo onwe ya nʼokpuru ndị na-achị achị, nʼihi na ikike ọchịchị ọbụla agaghị adị ma ọ bụrụ na Chineke akwadoghị ya. Ọ bụkwa Chineke tọrọ ntọala ikike ọchịchị niile e nwere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 13:1
25 Iomraidhean Croise  

Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu, Ub͕ò abua ka m'nuworo nka; Na ike nile bu ihe Chineke nwere:


Nwam, tua egwu Jehova na eze: Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:


ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma:


N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya.


Aganēsi kwa n'ebe madu bi chupu gi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi; ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, oge asa gāgabiga kwa n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ka Ọ nēnye ya.


Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.


Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n'elu nye gi ya-ri: n'ihi nka onye raram nye n'aka-gi nwere nmehie kari.


Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n'ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri.


Ekwela ihe ọjọ meri gi, kama were ezi ihe meri ihe ọjọ.


Ya mere onye nēdo onwe-ya megide onye ahu nāchi isi, ọ nēguzogide iwu Chineke nyere: ma ndi nēguzogide gānata ikpé nye onwe-ha.


nēdorita onwe-unu n'okpuru ibe-unu nime egwu Kraist.


Ma nwoke ahu nke nēme nganga, n'egeghi nti onye-nchu-àjà ahu nke nēguzo ije ozi n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ma-ọbu n'egeghi nti onye-ikpe ahu, nwoke ahu gānwu kwa: i gēkpochapu kwa ihe ọjọ ahu n'Israel.


n'ihi ndi-eze na ndi nile nọ n'ọnọdu di elu; ka ayi we biri obi udo na nke di nwayọ nime nsọpuru-Chineke nile na ikwesi-nsọpuru nile.


Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-isi, n'okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula,


Ma otú ahu madu ndia nēmeru kwa anu-aru-ha n'irọ-nrọ-ha, ju kwa ibu-onye-nwe-madu, kwulu kwa ndi nọ n'ebube.


nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;


Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.


O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n'elu uwe-Ya na n'elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile.


Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu, Ime ka ha na ndi-isi nọdu, Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru: N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa, O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan