Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 12:17 - Bible Nso

17 Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 12:17
22 Iomraidhean Croise  

Josef we nye iwu, ha we kpojue ihe nile ha n'ọka, o nye kwa iwu inyeghachi ego-ha, nke onye ọ bula n'akpa-ya, na inye ha ihe ha gēri n'uzọ: ewe mere ha otú a.


Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ: Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.


Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya; M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di.


rapu onyinye-gi n'ebe ahu n'iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n'udo, mb͕e ahu bia kwa che onyinye-gi.


ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ.


Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.


Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu:


Nējegharinu n'amam-ihe n'ebe ndi nọ n'èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile.


ka unu we nējeghari dika o kwesiri unu n'ebe ha nọ, bú ndi nọ n'èzí, ka ihe ọ bula ghara kwa ikpa unu.


Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ.


unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.


Ya mere anamezube ka umu-ab͕ọghọ ndi di-ha nwuru luru di, mu kwa umu, nāchi kwa èzí-na-ulo-ha, ghara kwa inye onye nēmegide ayi ihe o gēji kwutọ:


nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.


ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya.


ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.


O we dina ala n>ukwu-ala-ya rue ututu: o we bilie tutu madu g=amata ibe-ya. Boaz we si, Ka aghara imara na nwayi batara n>ebe-nzọcha-ọka.


Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n'akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan