Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 11:8 - Bible Nso

8 dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Chineke nyere ha mọ nke oké ura, anya ighara ihu uzọ, na nti ighara inu ihe, rue ubọchi ta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Dịka e dere ya, “Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe; o mere nke a ruo taa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 11:8
13 Iomraidhean Croise  

Rue ta ndi ahu nēme dika ikpé mbu nile si di: ha adighi-atu egwu Jehova, ha adighi-eme kwa dika ukpuru nile ha si di, ma-ọbu dika ikpé-ha si di, ma-ọbu dika iwu si di, ma-ọbu dika ihe enyere n'iwu si di, nke Jehova nyere umu Jekob n'iwu, bú onye Ọ guru aha-ya Israel;


Mba ndia we nātu egwu Jehova, ma ọ bu arusi nile ha apiri api ka ha nēfè; umu-ha kwa, na umu umu-ha, dika ndi bu nna-ha mere, otú a ka ha onwe-ha nēme rue ta.


N'ihi na Jehova awukwasiwo unu mọ nke oké ura, we mechisie anya-unu ike, bú ndi-amuma; isi-unu, bú ndi-ọhù, ka O kpuchiwo-kwa-ra.


O we si, Je, si ndi nka, Nānunu, ma unu aghọtala; nāhunu, ma unu amatala.


Biko, nurunu nka, unu ndi di nzuzu, nke obi amam-ihe nādighi; anya abua ka ha nwere, ma ha adighi-ahu uzọ; nti abua ka ha nwere, ma ha adighi-anu ihe:


Nwa nke madu, n'etiti ulo nnupu-isi ahu ka i bi, bú ndi nwere anya ihu uzọ, ma ha ahughi, ndi nwere nti inu ihe, ma ha anughi; n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


M'we merua ha n'onyinye nile ha, n'ime ka nwa ọ bula nke nēmeghe àkpà-nwa mbu gabiga n'ọku, ka M'we me ka ha tọb͕ọrọ n'efu, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova.


O we si, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze Chineke: ma ndi fọduru ka anāgwa okwu n'ilu; ka ha ghara ihu n'ọhuhu, ghara kwa inuta n'ọnunu.


si, Jekuru ndi nka, si, N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli; N'ọhuhu unu gāhu, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:


ma Jehova enyeghi unu obi imara ama, na anya ihu ahu, na nti inu anu, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan