Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 11:4 - Bible Nso

4 Ma gini ka ndum-ọdu Chineke nāgwa Ya? Arapurum nye Onwem nnù ndikom iri-na-asa na ọgu iri, madu ndi ọ dighi mb͕e ha b͕uru ikperè nye Beal.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 11:4
12 Iomraidhean Croise  

O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya.


Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi: ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.


Ma M'gēme ka nnù madu iri-na-asa na ọgu iri fọdu n'Israel, bú ikperè nile nke anēb͕ughi nye Beal, na ọnu ọ bula nke nēsutughi ya.


O gēru kwa, na onye emeworo ka ọ fọdu na Zaion, na onye fọduru na Jeruzalem, onye nsọ ka agākpọ ya, bú onye ọ bula nke edeworo ya n'akwukwọ idi ndu nime Jerusalem:


ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n'ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M'nēnyeghi n'iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n'obim:


Mb͕e Efraim jiri ima-jijiji kwu okwu, ya onwe-ya buliri onwe-ya elu n'Israel: ma ikpe mara ya nime Beal, o we nwua.


Ma ya onwe-ya amaghi na ọ bu Mu onwem nyere ya ọka-ya na manya-vine ọhu ya, na manu ọhu ya, me ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba, bú nke ha ji mere Beal ihe.


M'gēseti kwa akam imegide Juda, na imegide ndi nile bi na Jerusalem; M'gēbipu kwa ndi Beal fọduru n'ebe a, na aha ndi-nchu-àjà arusi, ha na ndi-nchu-àjà nile;


Israel we kekọta onwe-ya n'aru Beal-peoa: iwe Jehova we di ọku megide Israel.


Anya-unu nāhu ihe ahu nke Jehova mere n'okwu Beal-peoa: n'ihi na nwoke ọ bula nke jesoro Beal-peoa, Jehova, bú Chineke-gi, ekpochapuwo ya n'etiti gi.


Ha we rapu Jehova, fè Baal na Ashtarot òfùfè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan