35 ma-ọbu ònye buru uzọ nye Ya, agēnyeghachi kwa ya ọzọ?
35 “Onye burula ụzọ nye Chineke ihe, nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?”
Ọ buru na i bu onye ezi omume, gini ka i nēnye Ya? Ma-ọbu gini ka Ọ nānara n'aka-gi?
Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi? Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.
Ò zighi ezi n'iwu ka m'were ihe nile nkem me ihe m'nāchọ? ma-ọbu ànya-gi jọrọ njọ, n'ihi na mu onwem bu ezi madu?
N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?