N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.
Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha; Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha: Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya? Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?
ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto.
N'ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ dighi ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ dighi ọtutu ndi-ike, ọ dighi ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ:
ebe emeworo ka anya obi-unu nara ìhè, ka unu we mata ihe bu olile-anya nke ọkpukpọ-Ya, mata kwa ihe bu àkù nke ebube nke ihe-nketa-Ya n'etiti ndi nsọ Ya,
Ọ bu kwa nka ka ayi ji nēkpe kwa ekpere bayere unu mb͕e nile, ka Chineke-ayi we gua unu na ndi kwesiri ọkpukpọ akpọrọ unu, ka O were kwa ike mezu ihe nile ọ bula nke diri idi-nma ezi nma na ọlu nile ọ bula nke okwukwe;
Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,
(n'ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n'iṅu iyi site n'aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si, Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi);
N'ihi nka, umu-nnam, nānunu ọku n'obi kari ime ka ọkpukpọ-unu na nrọputa-unu buru ihe nēguzosi ike: n'ihi na asi na unu e#me ihe ndia, unu agaghi-asu ngọngọ mb͕e ọ bula ma-oli: