Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 11:13 - Bible Nso

13 Ma ọ bu unu ndi mba ọzọ ka m'nāgwa okwu, (n'ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba ọzọ mu onwem bu, anamenye ije-ozim otuto):

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ugbu a, unu ndị mba ọzọ, ka m na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m enwe afọ ojuju nʼihi ije ozi m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 11:13
11 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e ha nēfè Onye-nwe-ayi òfùfè, nēbu kwa ọnu, Mọ Nsọ siri, Kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M'kpọworo ha ka ha lua.


O we sim, Ga ije-gi: n'ihi na Mu onwem gēsi n'ebe a zipu gi jekuru ndi mba ọzọ n'ebe di anya.


Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:


mb͕e ọ di Ya ezi nma ikpughe Ọkpara-Ya nimem, ka m'we zisa ozi ọma Ya n'etiti ndi mba ọzọ; ngwa ngwa mu na anu-aru na ọbara ab͕aghi ìzù:


Ma arigorom n'uzọ nkpughe; m'we debe n'iru ha ozi ọma ahu nke m'nēkwusa n'etiti ndi mba ọzọ, ma edeberem ya n'iru ndi akpọrọ ihe mb͕e ha nọ iche, ka m'ghara ibu onye nāb͕a ọsọ ma-ọbu onye b͕arari ọsọ n'efu n'uzọ ọ bula.


Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;


nke edebere mu onwem ka m'buru onye-nkwusa na onye-ozi ka m'we b͕a àmà ahu (anamekwu ezi-okwu, ekwughm okwu-ugha), ibu kwa onye-ozizí nke ndi mba ọzọ nime okwukwe na ezi-okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan