Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 1:6 - Bible Nso

6 ndi unu onwe-unu nọ kwa n'etiti ha, ndi akpọrọ ibu ndi nke Jisus Kraist:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Tinyere unu onwe unu ndị ahụ a kpọrọ ka ha bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 1:6
16 Iomraidhean Croise  

bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ?


Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye esitere n'aka Ya kpọbata unu na nnwekọ nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.


Ọ nējum anya na unu nēsi n'aka Onye kpọrọ unu n'amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n'ozi ọma di iche;


Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di;


Unu onwe-unu kwa, ọ bu ezie na emereri unu ka unu buru ndi ala ọzọ n'oge gara aga, buru kwa ndi-iro n'èchìchè-uche-unu nime ajọ ọlu nile unu, ma ub͕u a ka O mere ka unu na Ya di n'otù


nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n'uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n'etiti unu, site n'ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n'ezi-okwu;


ka unu we nējeghari dika ọ kwesiri Chineke, Onye nākpọbata unu n'ala-eze na ebube nke aka Ya.


nke O sitere n'aka ozi ọma ayi kpọbata unu nime ya, ka unu we nweta ebube nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,


Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;


N'ihi na akpọrọ unu ime nka: n'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n'ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile:


Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:


N'ihi nka, umu-nnam, nānunu ọku n'obi kari ime ka ọkpukpọ-unu na nrọputa-unu buru ihe nēguzosi ike: n'ihi na asi na unu e#me ihe ndia, unu agaghi-asu ngọngọ mb͕e ọ bula ma-oli:


Judas, orù nke Jisus Kraist, na nwa-nne Jemes, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi akpọworo, ndi ahuru n'anya nime Chineke, bú Nna-ayi, ndi edebewo kwara Jisus Kraist:


Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan