Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 1:26 - Bible Nso

26 N'ihi nka Chineke rara ha nye n'aka agu ihe-ihere: n'ihi na ndinyom-ha were nwanyi ha bu site n'ọmumu b͕anwere ihe nēmegide ka esi mu ha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 1:26
14 Iomraidhean Croise  

ha we kpọ Lot òkù, si ya, Òle ebe ha nọ, bú ndikom ndi bakutere gi n'abali a? me ka ha putakute ayi, ka ayi we mara aru-ha.


M'we zilaga ha n'isi-ike nke obi-ha, Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha.


N'ihi ya Chineke rara ha nye n'aka adighi-ọcha n'ihe ọjọ nile nāgu obi-ha, ka ewe me aru-ha ihe-ihere n'etiti ha:


Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;


Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,


madu ndi, ebe nmehie-ha nādighi-ewuta ha ọzọ, ha rara onwe-ha nye n'aka agu ikwa-iko, iluputa adighi-ọcha nile nime anya-uku.


n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo.


ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke;


nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, nye ndi nēzu madu n'ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu;


Ma ndia nēkwulu ihe nile, ka ha ra, bú ihe ha nāmatagh: ma ka ha ra, bú ihe ha nāghọta site n'ọmumu, dika anu nēnweghi uche, nime ihe ndia ka anēmebi ha.


Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n'ikwa-iko n'uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n'iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi.


Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan