Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Kọlọsị 4:8 - Bible Nso

8 onye m'nēzitere unu ime ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Kọlọsị 4:8
16 Iomraidhean Croise  

Kasienu, kasienu ndim obi, ka Chineke-unu nāsi.


N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula.


Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.


Ariọrọm Taitọs, ziga kwa nwa-nna-ayi ahu ka o so ya. Ọ̀ gābu na Taitọs rib͕uru unu n'uzọ ọ bula? àyi eweghi otù Mọ ahu jeghari? àyi esoghi n'otù ije-ukwu ahu?


ya mere, kama ibara ya nba ọzọ anamachọ ka unu were amara b͕aghara ya kasi kwa ya obi, ka aghara iji ihe-nwuta nke nēwutabiga ya ókè loda madu di otú a n'uzọ ọ bula.


onye m'nēzigara unu ime otù ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.


Ya mere ọ nānukarim ọku n'obi iziga ya, ka ọ gābu, mb͕e unu huru ya ọzọ, ka unu we ṅuria ọṅu, ka mu onwem we nwe kwa ihe-nwuta nke dikariri ntà.


ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n'ihu-n'anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist,


ọbuná dika unu matara otú ayi mere madu nile ọ bula nime unu, dika nna si emere umu nke aka ya, nāriọ unu, nākasi kwa unu obi, nāgwasi kwa unu okwu ike,


ayi we ziga Timọti, nwa-nna-ayi na onye nējere Chineke ozi n'ozi ọma nke Kraist, ka o we me ka unu guzosie ike, ka o we kasi kwa unu obi n'ihi okwukwe-unu;


N'ihi nka mu onwem kwa, mb͕e m'nāpughi idi nānagide ya ọzọ, eziterem ka m'mara okwukwe-unu, ma o nwere uzọ ọ bula onye-ọnwunwa ahu nwarari unu, ndọb͕u ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu we ghọ ihe-efu.


Ya mere werenu okwu ndia nākasirita ibe-unu obi.


N'ihi nka nākasiritanu ibe-unu obi, wulirita kwa ibe-unu elu dika ulo, dika unu nēme kwa.


Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ.


ka Ọ kasie obi-unu, me kwa ka ha guzosie ike n'ezi ọlu na ezi okwu nile ọ bula.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan