Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Kọlọsị 4:6 - Bible Nso

6 Ka okwu-unu di n'amara mb͕e nile, ihe eji nnú me ka ọ di utọ, ka unu we mata otú unu nāghaghi iza madu nile ọ bula.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Kọlọsị 4:6
33 Iomraidhean Croise  

Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile, Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.


Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.


Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọ Ikpé nile nke ọnu-Gi.


M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam.


Emewo gi ka i ma nma kari umu madu; Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua: N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke, M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.


Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu: Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.


Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu: Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu.


Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.


Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.


I gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, ndi-nchu-àjà gātusa kwa ha nnú, sure ha ọku, ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.


Onyinye ọ bula iji biaru nso nke onyinye-inata-iru-ọma-gi, i gēye kwa ya nnú; eme-kwa-la ka nnú nke ọgbugba-ndu Chineke-gi ghara idi n'onyinye-inata-iru-ọma-gi: n'onyinye-gi nile iji biaru nso ka i gēweta nnú nso.


Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n'èzí, madu azọ ya ukwu.


Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.


Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef?


Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara.


Unu gēzí umu-unu ha, n'ikwu okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.


Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.


kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan