4 ka m'we me ka ọ puta ìhè, dika m'nāghaghi ikwu ya.
4 ka m nwee ike kwuo ya ka o doo anya otu m kwesiri.
Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi,
Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu.
Ya mere ebe ayi nwere olile-anya di otú a, ayi nēkwuwa okwu nke-uku,
nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu.
Nējegharinu n'amam-ihe n'ebe ndi nọ n'èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile.
Ka okwu-unu di n'amara mb͕e nile, ihe eji nnú me ka ọ di utọ, ka unu we mata otú unu nāghaghi iza madu nile ọ bula.