site-kwa-nu n'ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n'oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka,
N'ihi nka ayi onwe-ayi kwa, site n'ubọchi ayi nuru ya, ayi ewepughi aka n'ikpe ekpere na iriọ aririọ n'ihi unu, ka ewe me ka unu juputa na nmazu nke ihe Ọ nāchọ nime amam-ihe na nghọta nile nke Mọ Nsọ,
buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.
Epafras, onye bu otù onye n'etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n'ihi unu n'ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ.