ha bu ndi nwere anya nke juputara n'aru nwanyi nākwa iko, anya nke nāpughi kwa ighara imehie; ha bu kwa ndi nārafu nkpuru-obi ndi nādighi-eguzosi ike; ha nwekwara obi anwaputaworo n'anya-uku; buru kwa umu nke ọbubu-ọnu;
N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.