Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Kọlọsị 3:19 - Bible Nso

19 Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n'ebe ha nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Kọlọsị 3:19
14 Iomraidhean Croise  

Aisak we me ka Rebeka bata n'ulo-ikwū Sera, bú nne-ya, o we kuru Rebeka, o we ghọ nwunye-ya; Aisak we hu ya n'anya: ewe kasie Aisak obi ka nne-ya nwusiri.


Di ndu ọṅù, gi na nwunye nke i huru n'anya, ubọchi nile nke ndu ihe-efu-gi, nke O nyeworo gi n'okpuru anyanwu, ubọchi nile nke ihe-efu-gi: n'ihi na nke ahu bu òkè-gi na ndu, na nime ndọb͕u-gi nke gi onwe-gi nādọb͕u onwe-gi n'ọlu n'okpuru anyanwu.


Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.


Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:


Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu:


Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ya;


Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.


Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha.


Ma ọ buru na unu nwere ekworo di ilu na ikpa-iche-iche n'obi-unu, unu anyala isi, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha megide ezi-okwu.


Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan