Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Kọlọsị 3:13 - Bible Nso

13 nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Kọlọsị 3:13
25 Iomraidhean Croise  

Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ; Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.


ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;


B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ.


Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu.


B͕aghara kwa ayi nmehie nile ayi; n'ihi na ayi onwe-ayi nāb͕aghara kwa onye ọ bula nke ji ayi ugwọ. Ewebà-kwa-la ayi nime ọnwunwa.


Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà.


N'ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto.


Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n'ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n'ihi unu ka m'meworo ya n'iru Kraist;


nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya,


Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n'uzọ di otú a.


n'obi di ume-ala na idi-nwayọ nile, n'ogologo ntachi-obi, nānagiderita ibe-unu nime ihu-n'anya;


nweritanu obiọma n'aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.


nējeghari-kwa-nu n'ihu-n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ayi, dika ihe echere n'iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ.


Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi;


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


N'ihi na akpọrọ unu ime nka: n'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n'ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan