Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.
Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam.
ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem.
Ya mere ebe ayi bu ndi Chineke muru, o kwesighi ka ayi nēchè na Ihe akpọrọ Chineke yiri ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu nkume, ihe apiri api site na ǹkà na ihe di n'obi madu.
nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu.
Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.
Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.