Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Kọlọsị 2:1 - Bible Nso

1 N'ihi na anamachọ ka unu mata otú m'nāb͕asi nb͕a ike nke-uku n'ihi unu na ndi bi na Leọdisia na ka ha ra, bú ndi akāhughi irum n'anu-aru;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ọ bụ ọchịchọ m ka unu ghọta otu m si na-agbasi mgba ike nke ukwuu nʼihi unu, na nʼihi ndị nọ nʼobodo Laodisia, na ndị niile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Kọlọsị 2:1
18 Iomraidhean Croise  

Rechel we si, Nb͕a Chineke ka mu na nwa-nnem nwayi b͕aworo, enwewokwam ike: o we kpọ aha-ya Naftali.


Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n'obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n'ala.


Ma ub͕u a, le, mu onwem matara na unu onwe-unu nile, ndi m'jeghariri n'etiti unu nēkwusa ala-eze Chineke, na unu agaghi-ahu irum ọzọ.


ihe nēb͕u ha nb͕u kari ihe nile bu okwu nke o kwururi, na ha agaghi-ahu iru-ya ọzọ. Ha we dupu ya n'ije-ya rue mb͕e ọ batara n'ub͕ọ.


Umu-ntakirim, unu ndi ime unu nēmem ọzọ rue mb͕e agēme ka udi Kraist di nime unu,


ebe unu nwere otù nb͕a ahu nke unu huru n'arum, ub͕u a ka unu nānu kwa na ọ di n'arum.


Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n'ahuhu m'nāhu n'ihi unu, anamemezu kwa n'akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n'anu-arum n'ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya;


anamadọb͕u kwa onwem n'ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n'ike.


N'ihi na ọ bu ezie na anọghm n'etiti unu n'anu-arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.


kama ọ bu ezie na ayi hururi ahuhu na mbu, eme kwa ayi ihe-ihere, dika unu matara, na Filipai, ma ayi kwuwara okwu nime Chineke-ayi igwa unu ozi ọma Chineke n'oké nb͕a.


Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,


Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto:


ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n'akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan