Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 9:6 - Bible Nso

6 Ndi nile nwe Shekem we chikọta onwe-ha, ha na ulo nile nke Milo, ha we je me Abimelek ka ọ buru eze, n'akuku osisi terebinth nke ogidi ahu nke di na Shekem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 9:6
8 Iomraidhean Croise  

Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike, o we kpọ ya obodo Devid. Devid we wue obodo gburugburu site na Milo we rue n'ime-ya.


Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru, ime ya eze.


O rue, mb͕e Israel nile nuru na Jeroboam alatawo, ha we zìe kpọ ya ibia na nzukọ-ha, ha we me ya eze Israel nile: ọ dighi ebo ọ bula soro ulo Devid, ma-ọbughi ebo Juda, nání ya.


Jeroboam we wue Shekem n'ugwu Efraim, biri n'ebe ahu; o si n'ebe ahu pua, wue Penuel.


Ndi-orù-ya we bilie, kekọta nkekọta-madu imegide ya, tib͕ue Joash n'ulo Milo, n'uzọ nke nāridaru Sila.


Joshua we de okwu ndia n'akwukwọ iwu Chineke; o we were nkume uku, me ka o guzo ọtọ n'ebe ahu n'okpuru osisi oak ahu nke di n'ebe nsọ Jehova.


O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya.


Ha we gosi ya Jotam, o we je guzo n'elu ugwu Geraizim, welie olu-ya, kpọ, si ha, Genum nti, unu ndi-nwe Shekem, ka Chineke we ge unu nti.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan