Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 9:45 - Bible Nso

45 Abimelek we buso obodo ahu agha ubọchi ahu nile; o we were obodo ahu, b͕ue ndi nọ nime ya: ọ kwatue obodo ahu, ghasa ya nnú.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

45 Ụbọchị ahụ niile, Abimelek busoro obodo ahụ agha tutu ruo mgbe o meriri ya, gbuo ndị niile bi nʼime ya. Emesịa, ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, fesaa nnu nʼala ya niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 9:45
8 Iomraidhean Croise  

Jeroboam we wue Shekem n'ugwu Efraim, biri n'ebe ahu; o si n'ebe ahu pua, wue Penuel.


Ha we tipia obodo nile ha; ha nātubà kwa, nwoke ọ bula nkume-ya, n'ezi òkè ala-ubi ọ bula, tujue ya; ha nēkpochi kwa isi-iyi miri nile, me ka ezi osisi nile da: rue mb͕e ọ bu nání na Kia-hareset ka emere ka nkume-ya fọdu; ma ndi-ọma-èbè b͕ara ya buruburu, tib͕ue ya.


Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.


Ma ebe-ya nile nke bu nání apiti, na ọdọ-miri-ya nile, agaghi-agwọ ha; nnú ka agārara ha nye.


N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, puta), n'ezie Moab gādi ka Sọdọm, umu Amon gādi kwa ka Gọmọra, ihe-onwunwe nke akuba, na olùlù-nnú, na ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ndim fọduru gāluta ihe-ha n'agha, ndi mbam fọduru gēketa kwa ha.


mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya:


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


Abimelek na usu ndi soro ya we made, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: usu abua ahu we made imegide ndi nile nọ n'ọhia, tib͕ue ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan