Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 9:24 - Bible Nso

24 ka ihe-ike emere ọgu umu-ndikom Jerubeal atọ na iri we bia, ka ewe tukwasi kwa ọbara-ha n'isi Abimelek, bú nwa-nne-ha, onye b͕uru ha, na n'isi ndi-nwe Shekem, ndi mere ka aka-ya abua di ike ib͕u umu-nne-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Chineke mere nke a nʼihi na ọ chọrọ ịbọta ọbọ ọbara iri ụmụ Jerub-Baal asaa ahụ nʼisi Abimelek, na ndị Shekem ahụ bụ ndị nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 9:24
12 Iomraidhean Croise  

Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.


Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.


ma mb͕e Esta batara n'iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n'isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n'elu osisi.


Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya, Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.


M'gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di: M'gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.


Unu emeru-kwa-la ala ahu nke unu onwe-unu bi nime ya: n'ihi na ọbara, nke ahu nēmeru ala: ma ala, agaghi-ekpuchiri ya nmehie-ya bayere ọbara awusiri nime ya, ma-ọbughi nání n'ọbara nke onye wusiri ya.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nānara ihe-iri-ngo itib͕u madu, bú iwusi ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n'okpuru table nkem: dika m'meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n'ebe ahu.


Ndi-nwe Shekem we do ndi nēruru ya nbì n'elu ugwu nile ha, ha we punara onye ọ bula nke nāgabiga n'uzọ ahu n'akuku ha ihe: ewe gosi Abimelek.


Samuel we si, Dika mma-agha-gi meworo ndinyom ka ha b͕ara aka nwa, otú a ka nne-gi gāb͕ara aka nwa n'etiti ndinyom. Samuel we b͕ukasia Egag n'iru Jehova nime Gilgal.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan