Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 8:33 - Bible Nso

33 O rue, mb͕e Gideon nwuru, na umu Israel laghachiri, soro Bealim nākwa iko, doro onwe-ha Beal-berit ka ọ buru chi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Ọ dịghị anya ka Gidiọn nwụsịrị, ụmụ Izrel laghachiri azụ bido ife chi Baal. Ha guzobere Baal-Berit ka ọ bụrụ chi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 8:33
17 Iomraidhean Croise  

Jehoash we me ihe ziri ezi n'anya Jehova ubọchi-ya nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, zíri ya ihe.


Ndi nēchè èchìchè ime ka ndim chezọ aham site na nrọ nile ha nke ha nēzeritara ibe-ha n'otù n'otù, dika ndi bu nna-ha chezọrọ aham site na Beal.


O rue, site n'idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko.


Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi ma-kwa-ra omume nile nke Jehova, nke O mere Israel.


Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova, fè Bealim, na Ashtarot, na chi nile nke Siria, na chi nile nke Zaidon, na chi nile nke Moab, na chi nile nke umu Amon, na chi nile nke ndi Filistia, òfùfè; ha we rapu Jehova, ha efèghi kwa Ya òfùfè.


ha we rapu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt puta, ha we jezo chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ ha gburugburu, ha we kpọ isi ala nye ha: we kpasue Jehova iwe.


Ọzọ kwa, ha egeghi nti ndi-ikpé-ha, n'ihi na ha soro chi ọzọ nākwa iko, we kpọ isi ala nye ha: ha siri n'uzọ ahu wezuga onwe-ha ngwa, bú nke ndi bu nna-ha jere nime ya, n'inu ihe nile Jehova nyere n'iwu; ma ha emeghi otú a.


O rue, n'ọnwu onye-ikpe ahu, na ha laghachiri, we bibie onwe-ha kari ndi bu nna-ha, n'ijeso chi ọzọ ifè ha òfùfè, na ikpọ isi ala nye ha; ha ekweghi ka ihe si n'omume nile ha, ma-ọbu n'uzọ-ha siri ike, dapu.


Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, chezọ Jehova, bú Chineke-ha, fè Bealim na Asherot.


Gideon we me ya ka ọ buru ephod, guzo ya ọtọ n'obodọ-ya, bú Ọfra: Israel nile we soro ya nākwa iko n'ebe ahu: o we ghọrọ Gideon, ghọ-kwa-ra ulo-ya, ọnyà.


Gideon nwa Joash we nwua n'ezi isi-awọ, elìe ya n'ílì Joash, bú nna-ya, n'Ọfra nke ndi Abieza.


Ha we pua ba n'ubi, ghọ nkpuru ubi-vine nile ha, zọcha nkpuru-vine, me ememe otuto, ba n'ulo chi-ha, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, kọcha Abimelek.


Ha we nye ya ọgu ọla-ọcha atọ na iri sitere n'ulo Beal-berit, nke Abimelek ji go ndikom efu ndi obi-ha nādighi adi n'otù ebe, ha we jeso ya.


Ndi nile nwe ulo-elu Shekem we nu ya, ba n'ulo kachasi elu nke ulo El-berit.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan