Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 8:10 - Bible Nso

10 Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n'ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Nʼoge a, Zeba na Zalmuna na puku ndị agha iri na ise fọdụụrụ ha nọ na Kako. Ndị a bụ naanị ndị agha fọdụrụ nʼime usuu ndị agha ndị Midia niile. Nʼihi na ọnụọgụgụ ndị agha e gburu egbu dị narị puku na iri puku abụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 8:10
17 Iomraidhean Croise  

Eze Moab we hu na agha ahu di ike kari ya, o we chiri nnù ndikom na ọgu iri-na-ise tiyere onwe-ya, bú ndi nāmiputa mma-agha, itiwaru eze Edom:


Abaija na ndi-ya we tib͕ue ha ọtutu ntib͕u: orú nnù ndi eb͕uru eb͕u ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, we dapu n'Israel.


Peka nwa Remalaia b͕uru nime Juda orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise n'otù ubọchi, ha nile bu ndi-dìnkpà; n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.


Umu Israel we dọta n'agha nime umu-nne-ha orú nnù madu orú uzọ na uzọ ise, bú ndinyom, na umu-ndikom, na umu-ndinyom, ọzọ kwa, ọtutu ihe-nkwata ka ha lutara n'aka-ha n'agha, ha we webata ihe-nkwata ahu na Sameria.


Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


N'ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n'aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n'ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n'ubọchi nke Midian.


Umu Benjamin we gukọta onwe-ha n'ubọchi ahu site n'obodo nile ha, orú nnù uzọ atọ na nnù ise, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi ndi bi na Gibea, ndi gukọtara onwe-ha, nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa.


Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha.


Ndi-isi ndi Israel nile, bú ebo nile nke Israel, we guzo onwe-ha nime nkpọkọta ndi Chineke, orú nnù ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndi ji ukwu eje, ndi nāmiputa mma-agha.


Benjamin we si na Gibea puta izute ha n'ubọchi nke-abua ahu, ha we bibie ọzọ rue ala n'etiti umu Israel orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise; ndia nile nāmiputa mma-agha.


Jehova we tib͕ue Benjamin n'iru Israel: umu Israel we bibie orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri-na-ise nime Benjamin ubọchi ahu: ndia nile nāmiputa mma-agha.


Ndi nile ndi si na Benjamin da n'ubọchi ahu di orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ndi nāmiputa mma-agha; ndia nile bu ndi-dìnkpà.


N'ihi na ha na anu-ulo-ha na ulo-ikwū nile ha rigoro, ha batara dika ojuju igurube n'iba-uba; ọnu-ọgugu adighi kwa ha, ọ dighi kwa camel-ha: ha we bata n'ala ibibi ya.


Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n'uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba.


Gideon we bia, ma, le, otù nwoke nēzere ibe-ya nrọ, si, Le, arọrọm nrọ, ma, le, buruburu achicha ọka barley nākpọre ba n'ọmuma-ulo-ikwū Midian, ọ biarue ulo-ikwū, tie ya, o we da, achicha ahu we me ka o kpue iru, ulo-ikwū ahu we tọb͕ọ n'ala.


Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n'aru ibe-ya, na n'aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n'uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n'akuku Tabat.


Gideon we rigo n'uzọ ndi bi n'ulo-ikwū n'Iru-anyanwu Noba na Jọgbeha, o tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na ọmuma-ulo-ikwū ahu nọ na ntukwasi-obi na ihe agaghi-eme ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan