Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 7:9 - Bible Nso

9 O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na enyewom ya n'aka-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Bilie, gaa lụso ọmụma ụlọ ikwu ahụ agha, nʼihi na ana m aga inyefe ha nʼaka gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 7:9
23 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi unu gēnwe ibu agha n'agha nka: guzonu onwe-unu, guzo, hu nzọputa Jehova n'etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ: echi pukurunu ha; Jehova nọye-kwa-ra unu.


N'èchìchè sitere n'ọhù nile nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu,


Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ.


Ma mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ, si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya b͕alaga n'Ijipt, nọ n'ebe ahu rue mb͕e ọ bula m'gāgwa gi: n'ihi na Herod gaje ichọ Nwatakiri ahu ka ọ la Ya n'iyì.


N'ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m'nēkpe-kwa-ra guzorom nso n'abali a,


Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi.


Jehova we si Joshua, Atula egwu n'ihi ha: n'ihi na echi dika na mb͕e a Mu onwem gāra ha nile nye ka ha buru ndi eb͕uru eb͕u n'iru Israel: nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha ka i gēbipu, ọ bu kwa ub͕ọ-ala nile ha ka i gēsure n'ọku.


Ha we si Joshua, N'ezie Jehova enyewo ala ahu nile n'aka-ayi; ọzọ kwa, ndi nile ndi bi n'ala ahu nāb͕azepu n'iru ayi.


Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n'iru ya na mb͕e ahu,) si, M'gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m'gāgha? Jehova we si, Rigonu; n'ihi na echi ka M'gēnye ya n'aka-gi.


Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim.


Ọ si ha, B͕asonum n'azu: n'ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n'aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga.


Ma ọ buru na gi onwe-gi atua egwu irida, gi na Pura, bú nwa-okorọbia-gi, ridarue ọmuma-ulo-ikwū ahu:


Ndi ahu we were ihe-oriri-uzọ n'aka-ha, na opì-ike-ha: ma o zilagara ndikom nile nke Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, ma ọgu ndikom iri-na-ise ahu ka o jidere: ma ọmuma-ulo-ikwū Midian di n'okpuru ya nime ndagwurugwu ahu.


Jonatan we si, Le, ayi onwe-ayi nāgabiga rue ndikom ahu, ayi gēkpughe-kwa-ra ha onwe-ayi.


Devid we ju kwa Jehova ase ọzọ. Jehova we za ya, si, Bilie, rida rue Keila; n'ihi na Mu onwem nēnye ndi Filistia n'aka-gi,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan