Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 7:4 - Bible Nso

4 Jehova we si Gideon, Ndi Israel bara uba rue ub͕u a; me ka ha ridarue miri ahu, M'gānwaputa-kwa-ra gi ha n'ebe ahu: ọ gēru kwa, na onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a gēsoro gi je, ọ bu onye ahu gēsoro gi je; ma onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a agaghi-eso gi je, ọ bu onye ahu nāgaghi-eje.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ma Onyenwe anyị gwara Gidiọn, sị ya, “Lee, ndị agha gị ka dị ọtụtụ. Duru ha gbada na mmiri ala, m ga-anwale ha ma webilatara gị ọnụọgụgụ ha nʼebe ahụ. Ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a ga-eso gị jee,’ ọ ga-eje, ma ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a agaghị eso gị jee,’ ọ gaghị eso jee.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 7:4
10 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Chineke nwara Abraham, si ya, Abraham; ọ si, Lekwam.


N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.


Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa: Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike.


N'ihi na I nwawo ayi, Chineke: I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.


Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike: N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.


O we me ka ndi Israel ridarue miri ahu: Jehova we si Gideon, Onye ọ bula nke ji ire-ya ra miri, dika nkita nāra, onye ahu ka i gēdo n'onwe-ya iche; onye ọ bula kwa nke nēruru n'ikperè-ya abua iṅu miri.


Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole.


Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan