Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 7:1 - Bible Nso

1 Jerubeal (onye ahu bu Gideon), na ndi nile soro ya, we bilie n'isi-ututu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi Harod: ọmuma-ulo-ikwū Midian we di n'akuku Ugwu ha, site n'ugwu ntà More, nime ndagwurugwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Jerub-Baal, onye bụkwa Gidiọn, na ndị agha ya niile biliri nʼisi ụtụtụ, maa ụlọ ikwu ha nʼisi iyi Harod. Ma ndị agha Midia mara ụlọ ikwu nke ha nʼakụkụ ugwu ebe ndị Izrel nọ, nʼime ndagwurugwu nke dị nso nʼugwu nta More.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 7:1
14 Iomraidhean Croise  

Abram we gabiga n'ala ahu rue ebe Shekem, rue osisi terebinth nke More. Ndi Kenean nọ n'ala ahu mb͕e ahu.


Abraham we bilie n'isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, chiri madu abua nime umu-okorọbia-ya tiyere onwe-ya, na Aisak, bú nwa-ya nwoke; ọ kpọwa nkú nke àjà-nsure-ọku, bilie, je ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je.


Shama onye Harod, Elika onye Harod;


Me ha otú I mere Midian; Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon:


Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


Ugwu ndia, hà adighi n'ofè Jọdan, n'azu uzọ ọdida-anyanwu, n'ala ndi Kenean ndi bi n'Araba, na ncherita-iru Gilgal, n'akuku osisi terebinth nke More?


Joshua we bilie n'isi-ututu, ha we si na Shitim bilie ije, we biarue Jọdan, ya onwe-ya na umu Israel nile; ha we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu tutu ha agabiga.


Joshua we bilie n'isi-ututu, ndi-nchu-àjà we būru ib͕e Jehova.


Ọ we kpọ ya Jerubeal n'ubọchi ahu, si, Ka Beal kpegide ya, n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.


Ndi Midian nile na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu we chikọta onwe-ha, gabiga, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Jezreel.


Chineke we me otú a n'abali ahu: ọkpukpọ-nku we dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma igirigi dikwasiri n'ala nile buruburu.


Jerubeal nwa Joash we je biri n'ulo-ya.


Jehova we zite Jerubeal, na Bedan, na Jefta, na Samuel, we naputa unu n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi.


Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha nile rue Efek: Israel nāma kwa ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi nke di na Jezreel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan