Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 6:5 - Bible Nso

5 N'ihi na ha na anu-ulo-ha na ulo-ikwū nile ha rigoro, ha batara dika ojuju igurube n'iba-uba; ọnu-ọgugu adighi kwa ha, ọ dighi kwa camel-ha: ha we bata n'ala ibibi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Dịka usuu igurube ka ha na-abịa, ha na anụ ụlọ ha niile, na ụlọ ikwu ha niile. Ọnụọgụgụ ha dị ukwuu ruo na-apụghị ịgụta ole ha dị, maọbụ ịnyịnya kamel ha. Ha na-abata nʼala ahụ nʼihi ibibicha ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 6:5
13 Iomraidhean Croise  

Onye oji ka m'bu, ma amaram nma, Unu umu-ndinyom Jerusalem, Dika ulo-ikwū nile nke Kida, Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.


Ọ gaghi-abu ebe-obibi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ebi kwa nime ya rue ọb͕ọ nile: onye Arebia agaghi-ama kwa ulo-ikwū-ya n'ebe ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-eme kwa ka aturu-ha makpue n'ebe ahu.


Ìgwè camel gēkpuchi gi, umu-camel nke Midian na Ifa: ha nile gēsi na Sheba bia: ọla-edo na frankincense ka ha gēbute, ọ bu kwa ozi ọma otuto Jehova ka ha gēzisa.


Ha gēb͕utu oké ọhia-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na agaghi-eleputa ya; n'ihi na ha di ọtutu kari igurube, ha adighi kwa ọnu-ọgugu.


Ulo-ikwū nile ha na ìgwè ewu na aturu-ha ka ha gāchiri; ákwà-nkwuba nile ha na ihe nile ha na camel nile ha ka ha gēbupuru onwe-ha: ha gākpọ nkpu bayere ha, si, Ujọ di buruburu.


Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n'agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M'gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n'ofè-ya nile ka M'gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha ejiwo Onwe-ya ṅu iyi, si, N'ezie M'gēmeju gi na madu, dika igurube; ha gēti kwa nkpu megide gi, bú nkpu nke nzọcha-nkpuru-vine.


Nkpuru ala-ubi-gi na ndọb͕u-n'ọlu-gi nile ka otù ndi nke i nāmaghi gēri; ma i gābu nání onye anēmeb͕u emeb͕u na onye anāzọpia azọpia ubọchi-gi nile:


Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n'uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba.


Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n'ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.


Zeba na Zalmuna we si, Gi onwe-gi bilie, dakwasi ayi: n'ihi na dika nwoke si di, otú a ka idi-ike-ya di. Gideon we bilie, b͕ue Zeba na Zalmuna, were ihe nile yiri ọnwa nke di n'olu camel-ha.


Devid we tib͕ue ha site n'ururuchi we rue anyasi echi-ya: ọ dighi kwa otù nwoke nime ha wepugara onwe-ya, ma-ọbughi nnù umu-okorọbia, ndi nọkwasiri na camel-ha, we b͕alaga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan