Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 6:4 - Bible Nso

4 ha we ma ulo-ikwū-ha imegide ha, we bibie ihe-omume ala, rue ebe i gābà na Geza, ha arapughi kwa ihe nēdebe ndu n'Israel, ma ọ bu aturu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ha na-ebichi ala ahụ, bibie ihe niile a kụrụ nʼubi nʼala ahụ niile ruo na Gaza. O nweghị ihe ọbụla dị ndụ ndị Izrel nwere, ma atụrụ, ma ehi, ma ịnyịnya ibu, ha na-ahapụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 6:4
12 Iomraidhean Croise  

Ókè-ala nke ndi Kenean we buru site na Zaidon, mb͕e i nēje Gera, rue Geza: mb͕e i nēje Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, rue Lesha.


Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.


Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi.


Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.


Mu onwem gēme kwa unu nka; M'gēme obi-ọlulọ-miri ka ọ buru onye-nlekọta-unu, bú ọtita-aru na aru-ọku, nēme ka anya-unu hubìe uzọ, nēme kwa ka nkpuru-obi-unu b͕azepu: unu gāgha kwa nkpuru-unu n'efu, ndi-iro-unu gēri kwa ya.


Ọ buru na ndi-ori abiakute gi, ọ buru na ndi nāpunara madu ihe abia n'abali, (le otú alaworo gi n'iyì nke-uku!) hà agaghi-ezu ihe gēzuru ha n'ori? ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ?


Gi onwe-gi gāgha nkpuru, ma i gaghi-ewe ihe-ubi: gi onwe-gi gāzọcha nkpuru osisi olive, ma i gaghi-ete manu n'aru gi; i gāzọchapu kwa manya-vine ọhu, ma i gaghi-aṅu manya-vine.


Nkpuru ala-ubi-gi na ndọb͕u-n'ọlu-gi nile ka otù ndi nke i nāmaghi gēri; ma i gābu nání onye anēmeb͕u emeb͕u na onye anāzọpia azọpia ubọchi-gi nile:


ọ gēri kwa nkpuru nke anu-ulo-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, rue mb͕e agēkpochapu gi: ọ gaghi-ekwe kwa ka ọka, na manya-vine ọhu, na manu, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, fọduru gi, rue mb͕e ọ gēme ka i la n'iyi.


O rue, ọ buru na Israel agha nkpuru, na ndi Midian rigoro ya, na ndi Amalek, na umu Iru-anyanwu; ha we rigo imegide ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan