Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 6:31 - Bible Nso

31 Joash we si ndi nile nke guzoro megide ya, Unu onwe-unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gāzọputa ya? Onye nke gēkpere ya ọnu-ya, ka eme ka ọ nwua: rapu ya rue ututu; ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n'ihi na akwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Ma Joash tinyere ọnụ jụọ ha ajụjụ sị ha, “Baal, ọ gwara unu na ọ chọrọ ka unu nyere ya aka? Unu na-achọ ịzọpụta ya? Onye ọbụla wepụtara onwe ya maka ịlụrụ Baal ọgụ ga-anwụ tupu chi echi abọọ. Ọ bụrụ nʼezie na Baal bụ chi, hapụnụ ya ka o tigbuo onye ahụ mebiri ebe ịchụ aja ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 6:31
18 Iomraidhean Croise  

O rue, n'etiti-ehihie, na Elaija kwara ha emò, si, Werenu oké olu kpọ: n'ihi na chi ka ọ bu; n'ihi na ọ nātughari uche-ya, ma-ọbu na o wezugawo onwe-ya, ma-ọbu na ọ nọ n'ije, ma-ọbu eleghi anya ya onwe-ya nāraru ura, ma ọ gēteta.


O rue, mb͕e etiti-ehihie gasiri, na ha nēbu amuma rue mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di.


Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n'ebe ahu.


Esola ọtutu madu n'azu ba n'ihe ọjọ di iche iche: ab͕a-kwa-la àmà bayere ise-okwu ka i we wezuga onwe-gi iso ọtutu madu n'azu iwezuga ikpé:


Gosinu ihe ahu nile gābia n'ọdi-n'iru, ka ayi we mara na chi ka unu bu: e, menu ezi ihe, ma-ọbu menu ihe ọjọ, ka ayi we lerita onwe-ayi anya gburugburu n'ujọ, hu ya n'otù.


Bel eruruwo ala, Nebo amakpuwo amakpu; arusi nile ha di n'elu anumanu na n'elu anu-ulo: ihe nile unu nēbughariri bu ibu eboro ebo, ha bu ibu eboro anu nāda #mbà.


Ha nēbuli ya n'ubu, n'ebu ya, we dọba ya n'ọnọdu-ya, o we guzo; ọ gaghi-esi n'ebe-ya pua: e, madu gētiku ya nkpu, ma ọ gaghi-aza, ọ gaghi-azọputa ya n'ahuhu-ya.


Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.


Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n'ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n'ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n'aka.


Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune, bú ndi sitere na ndi nēledo ala ahu, we dọwa uwe-ha:


Ya mere okwu bayere iri ihe achuru n'àjà nye arusi, ayi matara na ọ dighi arusi ọ bula bu ihe n'uwa, ayi mata-kwa-ra na ọ dighi Chineke ọzọ ma-ọbughi otù.


unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya;


Ndikom obodo ahu we si Joash, Me ka nwa-gi puta, ka ọ nwua: n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà Beal, na n'ihi na o b͕utuwo Ashera nke di n'akuku ya.


Ọ we kpọ ya Jerubeal n'ubọchi ahu, si, Ka Beal kpegide ya, n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.


Jehova we zite Jerubeal, na Bedan, na Jefta, na Samuel, we naputa unu n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan