Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 6:26 - Bible Nso

26 wu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'elu ebe a siri ike, n'usoro, were kwa oke-ehi nke-abua ahu, were kwa nkù Ashera nke i gēb͕utu, sure àjà-nsure-ọku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Mgbe ahụ, wuoro Onyenwe anyị bụ Chineke gị ebe ịchụ aja, nʼelu ebe a dị oke elu. Jiri osisi Ashera ahụ nke ị gbuturu kwanye ọkụ, chụọ oke ehi nke abụọ ahụ dịka aja nsure ọkụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 6:26
8 Iomraidhean Croise  

Gad we biakute Devid n'ubochi ahu, si ya, Rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.


Arọna we si Devid, Ka onye-nwem, bú eze were ihe di nma n'anya-ya sure ọku, le, ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka nile na ihe ehi nile ka ha buru nkú:


kama unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, b͕utu Asherim-ha:


n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.


Ma ka eme ihe nile n'uzọ di nma n'anya, na n'usoro.


O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Were oke-ehi nke nna-gi nwere, bú oke-ehi nke-abua, nke b͕ara arọ asa, kwadà kwa ebe-ichu-àjà Beal nke nna-gi nwere, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya:


Gideon we chiri ndikom iri sitere na ndi-orù-ya, o me dika Jehova gwara ya okwu: o rue, n'ihi na ọ turu egwu ulo nna-ya na ndikom obodo-ya, ime ya n'ehihie, na o mere ya n'abali.


Ub͕ọ-ala ahu we ba n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, guzo n'ebe ahu, nkume uku di kwa n'ebe ahu: ha we kpọwa osisi ub͕ọ-ala ahu, sure ehi abua ahu ọku ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan