Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 6:21 - Bible Nso

21 Mọ-ozi nke Jehova we setipu nsọtu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, metu anu ahu na achicha ekoghi-eko ahu; ọku we si na nkume ahu di elu rigo, ripia anu ahu na achicha ekoghi-eko; mọ-ozi nke Jehova we pua n'anya-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ metụrụ ọnụ mkpanaka ahụ nke dị nʼaka ya nʼelu anụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko. Ọkụ sitere nʼoke nkume ahụ nwuru, rechapụ anụ ahụ na achịcha nʼekoghị eko ahụ. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị ahụ gbara barịị site nʼihu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 6:21
8 Iomraidhean Croise  

Ọku Jehova we da, ripia àjà-nsure-ọku ahu, na nkú-ya, na nkume nile, na àjà, rachapu kwa miri nke di n'ebe ahu miri dọrọ.


Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo, kpọkue Jehova; Ọ we were ọku si n'elu-igwe za ya n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.


Ma mb͕e Solomon kpebìri ekpere, ọku siri n'elu-igwe ridata, we ripia àjà-nsure-ọku na àjà nile; ebube Jehova we juputa ulo ahu.


Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama sitere n'aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru:


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.


Manoa we were nwa-ewu ahu na onyinye-inata-iru-ọma, surere ya Jehova ọku n'elu oké nkume: mọ-ozi nālu kwa oké ọlu, ma Manoa na nwunye-ya nēle ya anya.


O rue, mb͕e ire-ọku nēsi n'ebe-ichu-àjà ahu rigo n'elu-igwe, na mọ-ozi nke Jehova rigoro nime ire-ọku nke ebe-ichu-àjà ahu: Manoa na nwunye-ya nēle kwa ya anya; ha we da kpue iru-ha n'ala.


Mọ-ozi nke Chineke we si ya, Were anu nka na achicha ekoghi-eko nka, dọba n'elu nkume a di elu, wusi kwa ofé. O me otú a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan