Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 5:3 - Bible Nso

3 Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi; Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem; M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 “Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi! Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ. Aga m abụ abụ otuto nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 5:3
18 Iomraidhean Croise  

Ma Mu onwem, le, anameme ka iju-miri biakwasi uwa, ibibi anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, ka ọ pua n'okpuru elu-igwe; ihe nile nke di n'uwa gēkubi ume.


Mu onwem kwa, le, M'ganēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ, na n'ebe nkpuru-unu nọ, bú ndi gānọchi unu;


Elaija we si ndi Israel, Mu onwem, abum onye-amuma Jehova fọduru, náním; ma ndi-amuma Beal di nnù ndikom na ọgu abua na iri.


Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi: ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.


Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke usu-ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi; ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.


Anēsite kwa n'akam, bú mu onwem, Ataksakses, bú eze, nye ndi-odozi-àkù nile ndi nọ n'ofè osimiri iwu, na ihe ọ bula Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, gāriọ unu, ka eme ya ngwa ngwa,


M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam.


M'gēto Jehova n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.


Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu; M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya; M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma.


Otú a m'gābùku aha-Gi abù ọma rue mb͕e ebighi-ebi, Ka m'we kwughachi nkwam nile kwa-ubọchi.


Ma Mu onwem, le, enyewom Ọhọliab tiyere ya, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan; ọ bu kwa n'obi onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe ka M'tiyeworo amam-ihe, ka ha we me ihe nile nke M'nyeworo gi n'iwu:


M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.


Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe; Ka uwa nu kwa okwu ọnum:


N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa: Nyenu Chineke-ayi idi-uku.


Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi, Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri, Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan