Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 5:2 - Bible Nso

2 N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel, N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha, Gọzienu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel, mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha, toonu Onyenwe anyị!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 5:2
23 Iomraidhean Croise  

onye so ya bu Amasaia nwa Zikri, onye were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ya; ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi-dike bu dìnkpà:


Ndi-Ju we gọzie ndikom ahu nile ndi were afọ-ofufo nye onwe-ha ibi na Jerusalem.


Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:


Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n'ubọchi usu-ndi-agha-gi; N'ima-nma nile nke idi-nsọ, site n'afọ nke ututu; Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi.


Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:


Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, We duru ndi di iche iche bia n'okpurum.


Ka ugwu Zaion ṅuria ọṅu, Ka umu-ndinyom Juda tegharia egwú ọṅù, N'ihi ikpé-Gi nile.


Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova, Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.


Zaion nuru, we ṅuria, Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù; N'ihi ikpé-Gi nile, Jehova.


N'ihi na asi na emem ihe a ebe m'nāchọ ime ya, enwerem ugwọ-ọlu: ma ọ buru na emem ya mb͕e m'nāchọghi ime ya, ewerewo ntukwasi-obi nye ọchichi-èzí-na-ulo n'akam.


N'ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi.


Ka onye ọ bula n'etiti unu nye dika o buru uzọ rọputa n'obi-ya; ọ bughi site na nwuta, ma-ọbu site na nkpà: n'ihi na Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n'anya.


Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu: N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya, Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya, O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.


Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu, N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu; Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia, Ezi omume nke Jehova ka o mere, Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ.


n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma.


ma achọghm ime ihe ọ bula mb͕e i kēkweyeghi; ka idi-nma-gi we ghara idi ka agāsi na ọ di n'uzọ nkpà, kama ka o we di n'uzọ ọchichọ-obi-gi.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


n'ihi na ikpé-Ya nile bu ezi-okwu buru kwa ikpé ziri ezi; n'ihi na O kpere oké nwanyi ahu nākwa iko ikpé, bú nwanyi nke were ikwa-iko-ya mebie uwa, Ọ bọ̀-kwa-ra ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya n'isi-ya.


Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ, Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel: Gọzienu Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan