Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 5:11 - Bible Nso

11 N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri, N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova, Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel. Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 5:11
19 Iomraidhean Croise  

Ọ me ka camel nile b͕ue ikpere n'ala n'azu obodo ahu n'akuku olùlù-miri na mb͕e anyasi, na mb͕e ndinyom ndi nēsere miri nāputa.


Ọ hu, ma, le, olùlù-miri n'ọhia, ma, le, n'ebe ahu ìgwè ewu na aturu atọ nāmakpu n'akuku ya; n'ihi na ọ bu n'olùlù-miri ahu ka ha nēme ka ìgwè aturu-ha ṅua: nkume di kwa uku nke di n'elu ọnu olùlù-miri ahu.


Anāchikọta kwa ìgwè aturu nile n'ebe ahu: ha akpọrepu nkume ahu n'elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu ṅua, ha eweghachi nkume n'elu ọnu olùlù-miri n'ọnọdu-ya.


Mb͕e m'puru je rue ọnu-uzọ-ama n'akuku obodo, Mb͕e m'nēdozi ebe-ọnọdum n'amá,


Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa, Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.


Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi; N'ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha.


Unu gēji kwa obi-utọ seputa miri n'isi-iyi nile nke nzọputa.


Ọ gāghọ-kwa-ra onye nānọkwasi n'oche ikpé mọ nke ikpé, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi nāchughachi ndi nēbu agha rue ọnu-uzọ-ama idi-ike.


Guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova, we kpọsa okwu a n'ebe ahu, si, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile, ndi nābà n'ọnu-uzọ-ama ndia ikpọ isi ala nye Jehova.


Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua; Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.


Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayi N'ihi mma-agha nke ọzara.


Ndim, biko, cheta ihe Belak, bú eze Moab, b͕ara n'ìzù, na ihe Belam nwa Beoa zara ya; cheta site na Shitim rue Gilgal, ka unu we mara ezi omume nile nke Jehova.


unu gēme kwa ka ha abua putarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, unu gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha we nwua; nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o tighi nkpu n'obodo: na nwoke ahu, n'ihi na o wedawo nwunye madu-ibe-ya n'ala: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu, N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu; Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia, Ezi omume nke Jehova ka o mere, Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ.


na umu-ndinyom Israel nēje kwa-arọ ikọ akukọ nwa-nwayi Jefta onye Gilead ubọchi anọ n'arọ.


Ha rọputara chi ọhu di iche iche; Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile: Àhuru ọta ma-ọbu ube N'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel?


Ma ub͕u a, guzonu onwe-unu, ka mu na unu we kpe ikpe n'iru Jehova bayere ezi omume nile nke Jehova, nke O mere unu na nna-unu-hà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan