Jehova, bú Chineke-unu, Ọ̀ nọyeghi unu? Ọ̀ meghi kwa ka unu zuru ike buruburu? n'ihi na Ọ nyewo n'akam ndi bi n'ala; ebudawo kwa ala n'iru Jehova, na n'iru ndi-Ya.
Umu-ha we ba, nweta ala ahu, I we ruru ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, ala n'iru ha, were ha, na ndi-eze-ha, na ndi di iche iche nke ala ahu, nye n'aka-ha, ka ha were ha me dika ọ tọrọ ha utọ
Ma mb͕e ọ bula agēdowori ihe nile n'okpuru Ya, mb͕e ahu ka agēdo Ọkpara ahu Onwe-ya n'okpuru Onye ahu Nke doro ihe nile n'okpuru Ya, ka Chineke we buru ihe nile nime ihe nile.
Ma, le, Berak nāchu Sisera, Jael we puta izute ya, si ya, Bia, m'gēme kwa ka i hu nwoke ahu nke gi onwe-gi nācho. O we bakuru ya; ma, le, Sisera adawo nwua, ǹtú ahu di kwa n'akuku egedege-iru-ya.