Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 4:14 - Bible Nso

14 Debora we si Berak, Bilie; n'ihi na nka bu ubọchi nke Jehova nyeworo Sisera n'aka-gi: Jehova, Ọ̀ pughi we je n'iru gi? Berak we si n'ugwu Teboa rida, ya na orú nnù ndikom na nnù ise ndi soro ya n'azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 4:14
13 Iomraidhean Croise  

Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n'ebe a pua; n'ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n'anya di umu-ya.


Ndi ahu siri n'obodo pua, ha erughi n'ebe di anya, ma Josef siri onye bu onye-isi ulo-ya, Bilie, chua ndikom ahu; mb͕e i ruru ha aru i gāsi ha, N'ìhi gini ka unu were ihe ọjọ kwughachi n'ọnọdu ezi ihe?


O gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gēme ngwa: n'ihi na mb͕e ahu ka Jehova puworo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.


N'ihi na ọ bughi na ngwa ka unu gāpu, ọ bughi kwa na nb͕alaga ka unu gēje: n'ihi na Onye nāga n'iru unu bu Jehova; ọzọ, Onye nāga n'azu unu bu Chineke Israel.


Onye-ntipú ahu arigowo n'iru ha: ha etipúwo, we gabiga rue ọnu-uzọ-ama, pua na ya: eze-ha agabigawo kwa n'iru ha, Jehova kwa n'isi ha.


Ma i mawo ta, na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye nāgabiga n'iru gi dika ọku nēripia eripia; Ya onwe-ya gēkpochapu ha, Ya onwe-ya gēme kwa ka ha ruru ala n'iru gi: i we napu ha ala-ha, me kwa ka ha la n'iyì ngwa ngwa, dika Jehova gwaworo gi okwu.


Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi.


Bilie, do ndim nsọ, si, Donu onwe-unu nsọ bayere echi: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ihe ewezugara nyem di n'etiti gi, Israel: i pughi iguzosi ike n'iru ndi-iro-gi, rue mb͕e unu gēwezuga n'etiti onwe-unu ihe ahu ewezugara nyem.


Ọ si ya, Bilie, ka ayi la; ma ọ dighi onye nāza: o we būru ya n'elu inyinya-ibu-ya; nwoke ahu we bilie, je rue ebe nke ya.


Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo.


O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na enyewom ya n'aka-gi.


Ha we bilie n'isi-ututu: o we rue, mb͕e chi bọrọ, na Samuel kpọrọ Sọl n'elu-ulo, si, Bilie, ka m'we zilaga gi. Sọl we bilie, ha abua we pua, ya onwe-ya na Samuel, rue èzí.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan