Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya), n'ezie dika Teboa n'etiti ugwu nile, na dika Kamel n'akuku oké osimiri, otú a ka ọ gābia.
Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n'ihi na unu ka ikpé a diri; n'ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n'elu Teboa.
ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n'Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n'akuku Jọdan n'ọwuwa-anyanwu.
Ma Heba, bú onye-Kenait, siri na Ken kewapu onwe-ya, bú site n'umu Hobab nwa-nne nwunye Moses, we ma ulo-ikwū-ya rue osisi terebinth nime Zaananim, nke di n'akuku Kedesh.
Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon.
O zìe kpọ Berak nwa Abinoam ka o si na Kedesh-naftali bia, ọ si ya, Ọ̀ nyeghi iwu, bú Jehova, Chineke nke Israel, si, Je, dọrọ rue n'ugwu Teboa, chiri kwa n'onwe-gi orú nnù ndikom na nnù ise sitere n'umu Naftali, site kwa n'umu Zebulun?