Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.
Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova, fè Bealim, na Ashtarot, na chi nile nke Siria, na chi nile nke Zaidon, na chi nile nke Moab, na chi nile nke umu Amon, na chi nile nke ndi Filistia, òfùfè; ha we rapu Jehova, ha efèghi kwa Ya òfùfè.