Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 3:3 - Bible Nso

3 bú ndi-isi ise nke ndi Filistia, na ndi Kenean nile, na ndi Zaidon, na ndi-Haivait ndi bi n'ugwu Lebanon, site n'ugwu Beal-heamon rue nbata Hemat.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ndịisi ise nke ndị Filistia, na ndị Kenan niile, ndị Saịdọn na ndị Hiv, ndị bi nʼelu ugwu Lebanọn, site nʼugwu Baal-Hemon ruo na mbata obodo Hamat.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 3:3
31 Iomraidhean Croise  

Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi: Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o. Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon.


biarue ebe ewusiri ike nke Taia, na obodo nile nke ndi-Haivait na ndi Kenean, purue Negeb Juda, nime Bia-sheba.


Solomon we me ememe na mb͕e ahu, ya na Israel nile, nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt, n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ubọchi asa na ubọchi asa, bú ubọchi iri na anọ.


Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'umu Israel;


Ma akuku Ọdida-anyanwu gābu oké osimiri uku, site n'ókè-ala Ndida rue na ncherita-iru nbata Hemat. Nka bu akuku Ọdida-anyanwu.


Amalek bi n'ala Negeb; ndi Het na ndi Jebus na ndi-Amorait bi n'ugwu: ndi Kenean bi n'usọ oké osimiri, na n'akuku Jọdan.


unu gēsi n'ugwu Hoa kpaputarue nbata Hemat; ọpupu nile nke ókè-ala ahu gādiru kwa Zedad:


chenu iru, bulie ije, ba n'ugwu ndi-Amorait, ru kwa ab͕ata-ya nile, n'Araba, na n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na nime Negeb, na n'ọnu-miri nke oké osimiri, bú ala nke ndi Kenean, na Lebanon, rue Osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis.


(ndi Saidon nākpọ Heamon ahu Sirion, ma ndi-Amorait nākpọ ya Senia;)


Ọ dighi obodo nke mere ka ha onwe-ha na umu Israel di n'udo, ma-ọbughi ndi-Haivait ndi bi na Gibeon: ha nile ka ha were n'agha.


o zigara ndi Kenean n'Ọwuwa-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus n'ugwu, na ndi-Haivait n'okpuru Heamon n'ala Mizpa.


site na Shaihoa ahu, nke di n'iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n'akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa,


na ala ndi Gebal, na Lebanon nile, n'ọwuwa-anyanwu, site na Beal-gad n'okpuru ugwu Heamon rue nbata Hemat:


na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba;


Ndikom Israel we si ndi-Haivait, Eleghi anya n'etiti ayi ka unu onwe-unu nēbi; àyi na unu gēsi kwa aṅa b͕a ndu?


Ndi Zaidon kwa, na Amalek, na Maon, meb͕uru unu; unu we tikuem, M'we zọputa unu n'aka-ha.


Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka ndi Filistia, na n'aka umu Amon.


Ma nna-ya na nne-ya amaghi na ọ bu Jehova ka o sitere n'aka; n'ihi na uzọ Ọ gēsi megide ndi Filistia ka ya onwe-ya nāchọ. Ma na mb͕e ahu ndi Filistia nāchi Israel.


Ndikom ise ahu we je, biarue Laish, hu ndi ahu nke bi n'etiti ya, ka ha nēbi na ntukwasi-obi, dika ọme-n'ala ndi Zaidon si di, nādi jū nātukwasi kwa obi; ọ dighi kwa onye nēme ka ihere me ha n'okwu ọ bula n'ala ahu, bú onye nēnweta ike nb͕ochi, n'ebe di ndi Zaidon anya ka ha bi, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ.


nání ka ọb͕ọ nile nke umu Israel we mara, izí ha agha, nání ndi nāmaghi ha na mb͕e gara aga;


Jehova we renye ha n'aka Jebin, bú eze Kenean, onye bu eze nime Hezoa; onye-isi usuu-ndi-agha-ya bu kwa Sisera, ma onye ahu bi nime Haroshet nke mba di iche iche ọzọ.


Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.


Ndi-isi ndi Filistia we nāgabiga ọgu ise, ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: Devid na ndikom-ya nāgabiga kwa n'azu, ha na Ekish.


Ndi-isi ise nke ndi Filistia we hu ya, laghachi rue Ekron n'ubọchi ahu.


òké ọla-edo kwa, dika ọnu-ọgugu obodo nile nke ndi Filistia si di, bú nke ndi-isi ise ahu nwere, site n'obodo ewusiri ike we rue obodo ntà nke nēnweghi mb͕idi: we rue nkume uku ahu, bú Ebel, nke ha dọbara ib͕e Jehova n'elu ya: ọ di n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, rue ta.


Ha we si, Gini gābu àjà-ikpe-ọmuma ahu nke ayi gēnyeghachi Ya? Ha we si, Dika ọnu-ọgugu ndi-isi ndi Filistia si di, ọ bu emerod ọla-edo ise na òké ọla-edo ise ka unu gēnyeghachi: n'ihi na otù ihe-otiti diri ha nile, di-kwa-ra ndi-isi-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan