Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 3:29 - Bible Nso

29 Ha we tib͕ue Moab na mb͕e ahu, ihe ra ka orú nnù madu na nnù ise, nwoke ọ bula nke buru ibù, na nwoke ọ bula bu dìnkpà; ọ dighi kwa nwoke ọ bula wepugara onwe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 3:29
7 Iomraidhean Croise  

Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya, Me ka abuba nke di arọ́ di n'úkwù-ya;


Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba: Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako.


M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.


Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.


Ọ weta onyinye-inata-iru-ọma ahu nso Eglon eze Moab: ma Eglon bu nwoke mara abuba nke-uku.


Ọ si ha, B͕asonum n'azu: n'ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n'aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga.


Ewe me ka Moab ruru ala n'okpuru aka Israel n'ubọchi ahu. Ala ahu we di jū ọgu arọ anọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan