Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 3:28 - Bible Nso

28 Ọ si ha, B͕asonum n'azu: n'ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n'aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ọ sịrị ha, “Soronụ m nʼazụ, nʼihi na Onyenwe anyị enyela ndị Moab ndị iro unu nʼaka unu.” Ya mere, ha sooro ya gbadaa, gaa nọchie ụzọ niile ndị Moab nwere ike isi gafee osimiri Jọdan. Ha ekwekwaghị ka onye Moab ọbụla si nʼebe ahụ gafee.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 3:28
12 Iomraidhean Croise  

Eze Israel we pua, tib͕ue inyinya na ub͕ọ-ala, o tib͕u-kwa-ra ntib͕u uku n'etiti ndi Siria.


Ndikom ahu we nāchu ha n'uzọ Jọdan rue ngabiga-miri: ha we mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ndi nāchu ha n'azu pusiri.


Jehova we si umu Israel, Àzọputaghm unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi-Amorait, na n'aka umu Amon, na n'aka ndi Filistia?


Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m'gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è;


Ha we tib͕ue Moab na mb͕e ahu, ihe ra ka orú nnù madu na nnù ise, nwoke ọ bula nke buru ibù, na nwoke ọ bula bu dìnkpà; ọ dighi kwa nwoke ọ bula wepugara onwe-ya.


Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo.


Ibe-ya we za, si, Nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi mma-agha Gideon nwa Joash, bú nwoke Israel: Chineke enyewo Midian na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile n'aka-ya.


O rue, mb͕e Gideon nuru ọzize nrọ ahu na akukọ-isi-ya, na ọ kpọrọ isi ala; o we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū Israel, si, Bilienu; n'ihi na Jehova enyewo ọmuma-ulo-ikwū Midian n'aka unu.


Ọ si ha, Lenum anya, me-kwa-unu otú a: ma, le, mb͕e mu onwem nābà na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū-ha, ọ gēru kwa na, dika m'nēme, otú a ka unu gēme.


Gideon we ziga ndi-ozi n'ugwu Efraim nile, si, Ridatanu izute Midian, burunu ha uzọ were miri, rue Bet-bara, bú Jọdan. Ndikom nile nke Efraim we kpọkọta onwe-ha, were miri ahu rue Bet-bara, bú Jọdan.


O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na enyewom ya n'aka-gi.


ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n'ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n'aka-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan