Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 3:27 - Bible Nso

27 O rue, mb͕e ọ biara, na ọ fùru opì-ike n'ugwu Efraim, umu Israel we si n'ugwu ahu soro ya rida, ya onwe-ya we nọ n'iru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ fụrụ opi ike nʼala ugwu ugwu Ifrem, ndị Izrel sooro ya site nʼugwu ahụ rịda, ya onwe ya na-edu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 3:27
13 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n'amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n'obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n'ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze.


Ha we me ngwa, chiri, nwoke ọ bula uwe-ya, do ya n'okpuru ya n'elu ihe-nrigo, fùa opì-ike, si, Jihù bu eze.


M'we hu, bilie, si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Unu atula egwu ha: chetanu Onye-nwe-ayi, Nke di uku di kwa egwu, bu-kwa-ranu umu-nne-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na ndinyom-unu, na ulo-unu, agha.


Joshua we si ha, Ọ buru ndi bara uba ka i bu, rigorue oké ọhia n'onwe-gi, b͕utu-kwa-ra onwe-gi n'ebe ahu n'ala ndi-Perizait na Refaim; ebe ugwu Efraim diri gi nkpa.


n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.


Mb͕e Abimelek nwusiri, Tola nwa Pua, nwa Dodo, bú onye Isaka, we bilie izọputa Israel; ya onwe-ya bi kwa na Shamia n'ugwu Efraim.


Ma otù nwoke nke ugwu Efraim di, aha-ya bu Maika.


O rue, na mb͕e ahu, mb͕e eze nādighi n'Israel, na otù nwoke, bú onye Livai, di nānọ dika ọbìa n'akuku azu ugwu Efraim, o we si na Bet-lehem-juda kuru n'onwe-ya nwayi bu iko.


Ihud we wepuga onwe-ya mb͕e ọ nāb͕agwoju ha anya, ya onwe-ya we gabiga arusi ahu apiri api, wepuga onwe-ya rue Seira.


Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida; Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi. Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida, Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.


Mọ nke Jehova we were Gideon kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we fùa opì-ike; Abieza we kpọkọta onwe-ha n'azu ya.


Gideon we ziga ndi-ozi n'ugwu Efraim nile, si, Ridatanu izute Midian, burunu ha uzọ were miri, rue Bet-bara, bú Jọdan. Ndikom nile nke Efraim we kpọkọta onwe-ha, were miri ahu rue Bet-bara, bú Jọdan.


Jonatan we tib͕ue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia nke di na Geba, ndi Filistia we nu ya. Sọl we fùa opì-ike n'ala ahu nile, si, Ka ndi-Hibru nu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan