Ndị Ikpe 3:16 - Bible Nso16 Ihud we mere onwe-ya mma-agha nke nwere ọnu abua, ogologo-ya bu otù cubit; o ke ya n'okpuru uwe-nwuda-ya n'apata-ukwu aka-nri ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 Tupu ọ malite ije ya, o buru ụzọ kwadebere onwe ya mma agha nwere ihu abụọ na nzuzo. Ogologo mma ahụ ga-eru ihe dịka site nʼọnụ mkpịsịaka ruo nʼisi mbụ aka. Ehud kekwasịrị mma ahụ nʼapata ụkwụ aka nri ya, yikwasị ya uwe mwụda ya. Faic an caibideil |